1 Samuel 18

Ekworo Sọl

1Mgbe Devid gwasịrị Sọl okwu, ịhụnanya dị ukwuu malitere nʼetiti Jonatan na Devid. Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya. 2Sọl mere ka Devid nọgide nʼụlọeze. O kwekwaghị ka ọ laghachi nʼụlọ nna ya. 3Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya. 4Jonatan yipụtara uwe o yi nʼahụ nye ya Devid, nyekwa ya uwe ime ahụ ya, na ọ bụladị mma agha ya, ma ụta ya na eriri ukwu
Maọbụ, belịt
ya.

5Devid jeziri ozi niile Sọl ziri ya, o mere ihe niile nke ọma nke a mere na Sọl nyere ya ọkwa dị elu nʼetiti ndị agha ya. Ọnọdụ a dị mma nʼanya ndị Izrel nakwa nʼanya ndị agha Sọl.

6Mgbe ndị agha ahụ na-alọghachite, mgbe Devid gbusịrị onye Filistia
Ya bụ, Golaịat
ahụ, ndị inyom c sitere nʼobodo niile nke Izrel pụta izute eze Sọl. Ha na-abụ abụ na-ete egwu ọṅụ, nke ha ji ụbọ akwara na ihe egwu ndị ọzọ na-eti.
7Dịka ha na-ete egwu, ha bụrụ abụ sị,

“Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị agha
ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị agha.”
8Nke a were Sọl iwe nke ukwuu. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Gịnị bụ nke a? Ha enyela Devid ugwu dịka onye gburu iri puku kwụrụ puku ndị agha, ma mụ onwe m ka ha nyere naanị ugwu dịka onye gburu ọtụtụ puku ndị agha. Gịnị ọzọ fọdụrụ ya ugbu a, ma ọ bụghị naanị inweta alaeze?” 9Site nʼụbọchị ahụ gawa, Sọl malitere ile Devid anya ọjọọ.

10Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka. 11Ọ tụrụ ùbe ahụ, kwuo nʼobi ya sị, “Aga m atụgide Devid nʼaja ụlọ ahụ.” Ma Devid wezugara onwe ya, ugboro abụọ ndị a.

12Sọl na-atụ Devid egwu, nʼihi na Onyenwe anyị ahapụla Sọl, ma nọnyere Devid. 13Emesịa, Sọl mere ihe ga-eme ka ọ ghara ịhụkwa Devid anya ọzọ. O mere Devid ka ọ bụrụ onye na-elekọta puku ndị agha, ndị ọ na-edu na-aga ibu agha. 14Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma, nʼihi na Onyenwe anyị na-anọnyere ya. 15Mgbe Sọl hụrụ na ọ bụ onye nwere uche nke ọma, ọ tụrụ ya ụjọ. 16Ma Izrel na Juda niile hụrụ Devid nʼanya, nʼihi na ọ na-edu ha nʼagha.

17Sọl gwara Devid okwu sị ya, “Lee ada m nwanyị Merab. Aga m akpọnye gị ya, ka ị lụọ ya. Naanị jeere m ozi, lụọkwa agha Onyenwe anyị.” Nʼihi na Sọl kwuru nʼime obi ya sị, “Agaghị m ewelite aka m megide ya. Ka ndị Filistia mee nke ahụ.”

18Ma Devid sịrị Sọl, “Onyekwanụ ka m bụ, gịnịkwa bụ ezinaụlọ m maọbụ agbụrụ m nʼIzrel, nke m ga-eji bụrụ ọgọ nwoke eze?” 19O ruo, na mgbe a ga-eduru Merab, ada Sọl dunye Devid, akpọrọ ya nye Adriel, onye Mehola ka ọ lụọ.

20Nʼoge a, a chọpụtara na Mikal, ada Sọl hụrụ Devid nʼanya, mgbe e mere ka Sọl mata nke a, obi tọrọ ya ụtọ. 21O kwuru nʼobi ya sị, “Aga m akpọnye ya nwa m nwanyị, ka ọ bụrụ ihe ịma nʼọnya nye ya, ka aka ndị Filistia si otu a megide ya.” Ya mere, Sọl gwara Devid sị ya, “Ugbu a i nwekwara ohere ọzọ ịghọ ọgọ m nwoke.”

22Sọl nyere ndị ohu ya iwu sị, “Gwanụ Devid okwu na nzuzo sị ya, ‘Lee, ihe banyere gị masịrị eze, ndị niile na-ejere ya ozi hụkwara gị nʼanya. Ugbu a, kwerenụ ịbụ ọgọ ya.’ ”

23Ha gwara Devid okwu ndị a niile. Ma Devid zara sị, “Ọ bụ ihe nta ịbụ ọgọ eze? Mụ onwe m bụ onye ogbenye, onye a na-amaghị ama.”

24Mgbe ndị ohu Sọl gwara Sọl ihe Devid kwuru, 25ọ gwara ha sị, “Gwanụ Devid, ‘Eze achọghị ihe ọzọ dịka ụgwọ isi akụ ọbụla karịa naanị narị apị ndị Filistia. Ka ọ bụrụ ọbọ ọ ga-abọrọ m nʼisi ndị iro m.’ ” Ma ihe Sọl bu nʼobi bụ na a ga-egbu Devid nʼọgụ ahụ.

26Mgbe ndị ohu eze gwara Devid ihe eze kwuru, ọ tọrọ ya ụtọ, nʼihi ya, o kwenyere ịbụ ọgọ eze. Tupu oge ahụ a kara aka eruo, 27Devid na ndị agha ya pụrụ gbuo narị ndị Filistia abụọ, werekwa apị ha gosi eze. Sọl kpọnyere Devid Mikal, nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.

28Mgbe Sọl hụrụ na Onyenwe anyị na-anọnyere Devid, hụkwa na Mikal nwa ya nwanyị hụrụ Devid nʼanya, 29ọ tụrụ Devid ụjọ karịa na mbụ. Sọl kpọkwara Devid asị, gụọ ya dịka onye iro ụbọchị ndụ ya niile.

30Ndịisi agha Filistia na-apụta ibu agha dịka ha na-eme mgbe ọbụla, ma Devid na-eme nke ọma karịa ndị ọchịagha Sọl ndị ọzọ niile. Nke a mere ka Devid ghọọ onye a mara aha ya nʼala ahụ niile.

Copyright information for IboBIU